Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Nmekọrita Egbochiri-Egbochi

    Ọzọkwa, Chineke egbochiwo omume nnwekọ ma-ọbụ nkparite-ụka madụ na mụọ ndị nwụrụ-anwụ. “Mụọ ndị nājụ-ase,” dịka a nākpọ ndịa sitere n’ụwa ndị ọzọ nābia, ka akwụkwọ nsọ kpọrọ “mụọ nke ndj mụọ-ọjọ”. Lee Ọnụọgụgụ 25:1-3; Abụọma 106:28; Ndi lKọrịnt 10:20; Mkpughe 16:14. E gbochiri nmekọrite onye ọbụla na ha obụna rue ịta onye ọbụla nke mere ya ahụhụ nke ọnwụ. Livitikọs 19:31; 20:27. Kama ofufe mụo-ọjọ egbụwo ụzọ ya rue ogo nile nke nmụta, jupụtakwa na nzukọ di iche iche, ma hụtakwa iru-ọma n’ọgbakọ nile nke ndị nēme iwu, obụna n’òbi nke ndị-eze dị iche iche. Oke ndụhie nkaa nke jupụtakwara ebe nile bụ ntute n’ụdị ọhụ nke ndị mgba-nsị bụ nke ahụ a makwaraikpe n’oge ochie.OdU 44.2

    Site n'ikwupụta na ọbụna ndị kachasị ajọ-omume dịka asị na ha nọ n’elu-igwe, Ekwensu nāgwa ụwa nile sị: “nāgụghị ma ikwenyere na Chineke na Akwụkwọ-nsọ ma-ọbụ na ikwenyeghị, bie ndụ gị otu ọ masịrị gị; elu-igwe bụkwa nke gị.” Ma okwu Chineke nāsị: “Ahụhụ gādịrị ndị nākpọ ihe-ọjọ ez-i-ihe, ndị nākpọkwa ezi-ihe ihe-ọjọ; ndị nētinye ọchịchịrị n’ọnọdhụ ìhè, ma ìhè n’ọnọdhụ ọchịchịrị.” Azaia 5:20OdU 45.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents