Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 16—Pọl Jere Leta Jerusalem

    N‘oge n’eteghị anya mgbe Pọl chegharịsịrị, o jeruru Jerusalem, wee kwusaa Jisọs, na ebube nke amara Ya. Ọ kọrọ akụkọ ihe-iribama nke nchegharị ya, nke kpasuru ndị nchụ-àjà , na ndị-isi iwe, ha wee chọo iwepụ ndụ ya. Ma ka ndụ ya bụrụ ihe a zọpụtara, Jisọs biakutere ya ọzọ na ọhụụ mgbe ọ n’ekpe ekpere, n’asị ya, mee ngwa-ngwa pụa na Jerusalem; n’ihi na ha agaghị anabata àmà gị banyere m. Pọl riọsiri Jisọs arịrịọ ike, n’asi, Onyenwem, ha matara na a tụrụ m ha mkpọrọ tiekwa ha ihe n’ụlọ ikwu niile bụ ndị niile kweworo na gị ọbụna mgbe a wụsịrị ọbara oru gị Stiven, e guzogịdekwaram ha n’akụkụ na nkwenye n’ọnwụ ya, n’ejidekwa uwe ndị gburu ya. Pọl chere na ndị Juu nke Jerusalem agaghị emegịde ọgbụgba-àmà ya; na ha g’echeta na mgbanwe ukuu nka dị n’ime ya bụ naanị ike nke Chineke pụrụ ịlụpụta. Kama Jisọs sịrị ya, Pụa, n’ihi na m g’eziga gị ebe dị anya n’àlà ndị mba-ọzọ.NUA 98.1

    Mgbe Pọl n’anọghịkwa na Jerusalem ka o dere ọtụtụ akwụkwọ ozi nye ebe dị iche-iche, n’akọwa ihe ọ hụworo, n’agbakwa àmà sịrị ike; kama ụfọdụ madụ gbalịrị ibibi nhụku nke akwụkwọ-ozi ndịa. Ha kwenyere na akwụkwọ ozi ya ha rijuru afo ma dịkwa ike; kama na mbinyere onwe ya na anụ-arụ n’etiti ha adịghị ike, ọbụna okwu-ọnụ ya ka a n’akpọkwa ihe efu.NUA 98.2

    A hụrụ m na Pọl bụụrụ nwoke nwere oke-nmụta, na amamihe ya na omume ya n’adọrọ ndị n’ege ya ntị. Ọtụtụ ndị nwere nmụta nwere nmasị na amamihe ya, ọbụna ọtụtụ ha kwenyekwara na Jisọs. Mgbe ọbụla ọ nọ n’iru ndị-eze n’etiti ọgbakọ ukuu, ọ n’awụpụta nkwuwa-okwu ndịa n’arugịde ndị niile n’ege ya ntị. Nka n’akpasu ndị nchụ-àjà na ndị okenye iwe. Pọl n’adị na njikere mgbe niile ibanye na ntụghari uche dị omimi n’agakwa n’iru idọrọ akọ n’uche ndị n’ege ya ntị, rue n’ogo nghọta dịkasịrị elu, ma kọwapụtakwa omimi nke iba ụba nke amara Chineke, n’egosikwa ha ihe itu-n’anya nke ihụnanya Kraist. Ma sitekwa n’ụzọ dị mfe ọ g’abiarukwa na nghọta nke ndị dị àlà, ma sitekwa n’ụzọ dịkasịrị ike na akowapụta ihe ya onwe ya gabigaworo, nke mere ka ha chọsie ike ibụ ndị n’eso ụzọ Kraist.NUA 99.1

    Onyenwe-anyị kpuheere Pọl na o ghaghị ijeru Jerusalem ọzọ; na a g’eke ya agbụ n’ebe ahụ na ọ g’ahụjukwa anya n’ihi áhà ya. Ma ọ bụ ezie na ọ bụ onye-nkpọrọ ọtụtụ oge, ma Onyenwe-anyị na ebukwa ọlụ ya ahụ pụrụ iche n’aga n’iru site n’aka ya. Agbụ nke Pọl g’agụ ụzọ a g’esite na ya mee ka à márá ihe banyere Kraist, ma site otua nye Chineke otuto. Dịka e zigara ya site n’obodo rue obodo ọzọ n’ihi ikpe ya ikpe, o gbara àaà banyere Jisọs, na ihe omume dị iche-iche gbasara nchegharị ya ka ọ kọwapụtara n’iru ndị-eze, na ndị ọchịchị, ka ha ghara inọ na anụghị àmà banyere Jisọs.NUA 99.2

    Imerime madụ kwenyere na ya ma ñụriakwa n’aha ya. A hụrụ m na e mejupụtara ebum n’obe nke Chineke n’ime ije Pọl n’elu osimiri, ka ndị nọkwa n’ụgbọ miri ahụ gbaa àmà ike nke Chineke site n’aka Pọl, n’otu aka ahụ kwa ka ndị n’ekpere arụsị wee nụrụkwa áhà nke Jisọs, ma bụrụkwa ndị e mere ka ha chegharia site n’ozizi ya, sitekwa n’ihụ ihe-iribama niile nke ọ lụrụ. Ndị eze na ndị-ọchịchị ka ibobo nwụkwara n’arụ site n’ike nke ntụgharị uche ya, ma dịka, site n’ọnụ-ọku nke obi na ike nke Mụo-nsọ, o kwusara Jisọs, ma kọwapụtakwa ọtụtụ ihe dị iche-iche metụtara ndụ ya, ọmụma-ikpe nke uche rụgidere ha na Jisọs bụ Ọkpara nke Chineke, ọbụna mgbe ọ n’eju ụfọdụ anya ka ha n’ege okwu Pọl, otu onye tipụrụ mkpu, sị, ọ fọdụrụ ntakịrị ihe ka ịrugịde m ịbụ onye n’eso ụzọ Kraist. Ma ha chere na n’oge ọdị niru ka ha g’echebara uche n’ihe ha nụrụ. Ekwensu wee were ohere nke itu-nchichi ahụ, ma dịka ha lepụrụ ohere-oma ahụ anya mgbe e mere ka obi ha dị nro, o funarịrị ha ebighị-ebi. Obi ha bịara sie-ike karịsia.NUA 100.1

    E gosịrị m ọlụ nke Ekwensu na ọ malitere site n’ikpuchi anya nke ndị Juu ka ha ghara ịnabata Jisọs dịka Onye-nzọpụta ha; ọzọkwa, n’iduru ha, site n’anya uku n’ihi ọlụ-ebube ya dị iche-iche, iwere ndụ ya. Ekwensu bara n’ime otu ndị n’eso ụzọ ya, ma durukwa ya ịrara ya nye n’aka ha, ha wee kpọgbue Onye-nwe ndụ n’ebube. Mgbe Jisọs bilisịrị site n’ọnwụ, ndị Juu tụkwasịrị nmehie n’elu nmehie ka ha n’achọ ikpuchi ezi-àmà nke mbili n’ọnwụ ya, site n’iji ego zụta ndị nche nke Rom ka ha gbaa àmà-ụgha. Kama mbilite n’ọnwụ nke Jisọs ka e mesiri ezi-okwu ya ike karị sitekwa na mbilite n’ọnwụ nke ọtụtụ ndị-àmà ndị sokọrọ Ya bilie. Jisọs biakutere ndị n’eso ụzọ ya, na igwe madụ karịrị narị ise n’otu oge, ọbụna mgbe ndị ahụ soro ya bilikọọ biakutekwara ọtụtụ ndị madụ n’ekwupụta na Jisọs ebiliwori.NUA 100.2

    Ekwensu emewori ka ndị Juu nupụrụ Chineke isi, site n’ijụ inara Ọkpara ya, na sitekwa n’igwachu aka ha n’obara ahụ dịkarị oke ọnụ-ahia n’ikpgịde ya n’obe n’agbanyeghị ihe ngosi sịrị-ike na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, Onye-ngbapụta nke ụwà; ha gburu ya, n’adịghị mgbe ha chọrọ inara ihe ngosi ọbụla n’ikwenyere Ya. Naanị olile-anya ha na nkasi-obi ha, dịka nke Ekwensu mgbe ọ dasịrị, bụ ijisike merie Ọkpara Chineke. Ha nọgịdere n’ịgba mgba okpuru ha site n’ikpagbu ndị n’eso ụzọ Kraist, na igbu ha. Ọ dịghị ihe dara ụda-ọjọọ na ntị ha karịa áhà Jisọs onye ahụ ha kpọgịdeworo n’obe; ha kpebikwara na ha a gaghị anụrụ nkwupụta ọbụla banyere Ya. Dịka n’okwu banyere Stiven, mgbe Mụo-nsọ sitere n’ọnụ ya kọwapụta ihe ngosi dị-ebube o ji bụrụ Ọkpara Chineke, ha mechiri ntị ha ka ha gharakwa ịghọta. Ọbụna mgbe ebube nke Chineke kpudoro Stiven, ha tugbukwara ya na nkume. Ekwensu jidesịrị ndị ahụ gburu Jisọs ike. Site n’ọlu-ọjọọ ha niile, e werewo onwe ha nye n’aka ya dịka ngwa-ọlụ, o sitekwara n’aka ha n’alụ ọlụ nsogbu na nkpasu iwe nye ndị kwere na Kraist. O sitere n’aka ndị Juu lụa ọlụ ikpali ndị mba ọzọ megide áhà Jisọs, megịdekwa ndị niile n’eso ya, ma kwerekwa n’aha ya. Kama Chineke zigara ndị mụọ-ozi ya ịgba ndị n’eso ụzọ ya ume banyere ọlụ ha, ka ha nwe ike ikwupụta ihe ndị ha hụworo ma nụkwa, ma n’ikpeazu, nime nnọgịdesike ha, werekwa ọbara ha kaa ọgbụgba-àmà ha akara.NUA 101.1

    Ekwensu ñụrịrị ọñụ na o jisịrị ndị Juu ike n’ọnya ya. Ha gakwara n’iru n’omume ha n’abaghị uru ọbụla, n’ọchụchụ-aja ha na ụkpụrụ ha. Ka Jisọs kwu n’elu obe, wee tie mkpu, ọ gwụwo, akwa mgbochi nke ụlọ-nsọ gbawara abụa, site n’elu rue àlà, n’igosipụta na Chineke agaghịkwa ezute ndị nchụ-àjà n’ime ụlọ-nsọ, inara àjà ha na omenàlà ha; na igosikwa na a kutuwo mgbịdị nkewa ahụ nke dị n’etitit ndị Juu na ndị mba ọzọ. Jisọs e nyewo onyinye nke onwe ya n’ihi mba abụa ndịa, ọbụrụkwa na a zọpụtara madụ m’ọli, mba abụa ndịa aghaghị ikwere na Jisọs dịka naanị onyinye dịrị nmehie, na onye-nzọpụtanke ụwà.NUA 102.1

    Mgbe Jisọs kwu n’elu obe, dịka onye agha ji ube mapuru ya akuku, ọbara na miri pụtara, na ụzọ nsọpụta abụa were anya, otù òkpò nke ọbara na òkpò ọzọ nke miri dị ọcha. Ọbara ahụ ka eji a sacha nmehie niile nke ndị kwere n’aha Ya. Miri ahụ nọchitere anya miri nke ndụ ahụ nke e nwetara sịta na Jisọs inye ndụ n’onye ahụ nke kwere.NUA 103.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents