Isi Nke 34—Oke Iti-Mkpu Ahụ
Ahụrụ m ndị mụọ-ozi ka ha ji ọhụhụ n’ejegharị ọpụpụ na mbata n’eluigwe. Ha n’arịdata n’elu ụwà, ma n’arịgokwa ọzọ n’eluigwe, n’ejikere n’ihi nmezu nke ụfọdụ ihe omume dị mkpa. Mgbe ahụ a hụrụ m mụọ-ozi ukuu ọzọ e nyere ọlụ nke ịrịdata n’ụwà, ma jikọta ọlụ ya na nke mụọ-ozi nke atọ ahụ, ma nyekwa ike na nkwado na ozi ya. Ike na oke ebube ka e yikwasịrị mụọ-ozi ahụ, ma ka ọ na a ridata, ihè wakwasịrị elu ụwà site n’ebube ya. Ihè nke gara n’iru na nke n’esọkwa n’azụ mụọ-ozi a, nwunyere ebe niile, dịka ọ n’eti mkpu dị ukuu site n’olu-ike, n’asi, Babilọn ukuu ahụ a dawo, ọ dawo, ọ bụrụwokwa ebe obibi nke ndị mụọ-ọjọọ, na ụlọ nke mụọ niile n’adighị ọcha, na ụlọ nkpọrọ nke nnụnụ niile n’adịghị ọcha nke a kpọkwara asị. Ozi nke ọdịda Babilon, dịka mụọ-ozi nke abụa nyere ya, ka e nyekwara ọzọ, tinyekwara ọrụrụ niile nke n’abanye n’ime nzukọ site n’oge 1844. Ọlụ nke mụọ-ozia batara n’oge dị mma, n’ejikwọkwa na oke-ọlụ ikpeazụ nke ozi mụọ-ozi nke atọ ahụ, dịka ọ na amubanye n’oke itimkpu. Ma ndị nke Chineke ka ọ n’edozi ebe niile i guzoro n’oge-awa nke ọnwụnwa nke ha g’ezute n’oge n’eteghị-anya. A hụrụ m ihè ukuu ka ọ n’awakwasị ha, ka ha niile jikọrọ ọnụ n’ozi ahụ, ma sitekwa na atụghị-ụjọ ọbụla kwusaa a ozi mụọ-ozi nke ato ahụ n’ike.NUA 205.1
E zipukwara ndị mụọ-ozi inyere mụọ-ozi ukuu ahụ si n’eluigwe aka, ma a nụkwara m ọtụtụ olu nke dịka ọ n’ada ebe niile, si nụ n’ime ya pụta, ndị nkem, ka unu ghara isoro ya n’ime nmehie ya niile, ka unu gharakwa inata ihe otiti ya; n’ihi na nmehie ya niile eruwo eluigwe, ma Chineke echetawọkwa ajụọ-omume ya niile. Ozi nka dịka ozi ntụkwasị n’elu ozi nke ato ahụ, ma kekọtakwa ya, dịka mkpu etiti-abali ahụ kekọtara n’ozi mụọ-ozi nke abụa ahụ na 1844. Ebube nke Chineke nọkwasịrị ndị-nsọ ahụ nwere ntachi-obi, n’echekwa, na ha ji atụghị egwu ọbụla nye ịdọ aka na ntị ikpeazu ahụ dị nro, n’ekwupụta ọdịda nke Babụlọn, ma n’akpọkwa ndị nke Chineke ka ha si n’ime ya pụta; ka ha gbanarị nbibi ya dị oke egwu.NUA 206.1
Ihè ahụ nke wakwasịrị ndị ahụ nọ na nche wanyekwara ebe niile, ma ndị niile nwere ihè ọbụla na nzukọ niile, ndị na k’anụghị ma ju ozi atọ ndịa, zara oku a, ma rapụ nzukọ ndịa dárá-adà. Ọtụtụ abiaruwo ogologo oge nke nhazi site na mgbe e nyeworo ozi ndịa, na ihè ahụ wakwasịrị ha, ma ha nwere ohere ihọrọ ndụ m’ọbụ ọnwụ. Ụfọdụ họọrọ ndụ, ma gụzorokwa n’etiti ndị niile n’ele anya Onyenwe ha, ma n’edebekwa ihe niile O nyere n’iwu. Ozi nke atọ ahụ g’alụ ọlụ ya; madụ niile ka a n’anwale site na ya, ma ndị niile dị-ọcha ka a g’akpọppụta site n’okpukperechi dị iche-iche. Ike nke n’arugịde arugịde na akwali onye ziri ezi, mgbe ngosipụta nke ike Chineke n’ejide ndị ezi-n’ụlọ na ndị enyi n’itu-egwu, nke n’ọdịghị mgbe ha g’anwa, m’ọbụ nwe ike, igbochi ndị niile olu Mụo-nsọ nke Chineke metụrụ obi ha. Oku ikpeazu ahụ ka e bugara ọbụna nye ndị orù, ma ndị nwere okpukperechi n’ime ha, site na okwu nnweda-n’àlà, na abụ-abụ nke inwebiga ọñụ oke na olileanya nke mgbapụta ha, ma ndị nwe ha a pụghị ikwụsi ha; n’ihi na ụjọ na ngbọgwoju anya mechiri ha ọnụ. Ihe iriba àmà ukuu dị iche-iche ka e mere, a gwọrọ ndị ọria, ma ọlụ-ebube ha dị iche-iche soro ndị kwere ekwe. Chineke nọ n’ọlụ a, ma onye nsọ ọbụla, n’atụghị egwu ihe nlụpụta ọbụla, sọkwara ntụzi-aka nke akọ-n’uche ya, ma n’ejikọkwa onwe ya na ndị ahụ n’edebe iwu niile nke Chineke; ha niile wee n’ekwusa ozi nke atọ ahụ n’ike. A hụrụ m na ozi nke atọ ahụ g’emechi site n’ume na n’ike nke karịrị mkpu etiti-abali ahụ.NUA 207.1
Ndị oru nke Chineke, e mejupụtara n’ike nke sitere n’elu, ndị ihè wakwasịrị n’iru ha, nke na enwụkwa n’odịdo nsọ, gara n’iru iluzu ọlụ ha, n’ekwusakwa ozi ahụ nke sitere n’eluigwe. Mkpụrụ obi niile ndị gbasara n’òtù okpukperechi niile dị iche-iche zakwara òkua, na ndị dị oke ọnụ-ahia mere ngwa-ngwa gbapụta site na nzukọ ndị a n’àlá n’iyi, dịka Lọt mere ngwa gbapụta site na Sọdọm tutu mbibi ya. Ndị nke Chineke ka e doziworo ma gbaakwa ume site n’ebube ahụ magburu onwe ya nke dakwasịrị ha n’uju, n’akwado ha inagịde oge-awa nke ọnwụnwa. Ọtụtụ olu ka m nụrụ ebe niile, n’asi, n’ebea ka ntachi obi nke ndị nsọ dị; ndịa bụ ndị n’edebe ihe Chineke nyere n’iwu, na okwukwe nke Jisọs.NUA 208.1