Isi Nke 25—Ngosipụta Ndị N’ele-Anya Ọbịbịa-Abụa Ahụ
Ahụrụ m ọnụ-ọgụgụ ọgbakọ dị iche-iche ndị dịka ụdọ kekọtara ha n’otu. Ọtụtụ n’ime ọgbakọ ndịa nọkwa n’ọchịchịri. Anya ha rudatara àlà n’ime ụwà, na ọ dịghịkwa ihe yiri njikọta dị n’etiti ha na Jisọs. A hụrụ m madụ ndị gbasara n’ime ọgbakọ ndịa dị iche-iche ndị iru ha n’enwụ ihè, ndị n’ewerekwa anya ha lekwasi n’eluigwe. Ihè nke sitere na Jisọs, nke n’achapụtakwa dịka nke anyanwụ, n’adịnyerekwa ha. Otu mụọ-ozi wee gwa m ka m lezie anya nke ọma, m wee hu ka mụọ-ozi n’echegịde onye ọbụla n’ime ndịa niile nweworo nchawa nke ihè ahụ, mgbe ndị mụọ-ọjọọ gbakwara ndị ahụ niile nọ n’ọchịchịri gburu-gburu. A nụrụ m olu nke otu mụọ-ozi ka ọ n’eti, Tụa nụ egwu Chineke ma nyekwa ya otuto, n’ihi na oge-awa nke ikpe ya a biawo.NUA 149.1
Ihè dị ebube nọkwasikwara n’isi ọgbakọ ndịa, imụnyere ndị niile g’anara ya. Ụfọdụ ndị nọkwa n’ọchịchịri natakwara ihè ahụ ma ñụriakwa; mgbe ndị ọzọ jụkwara ihè ahụ sitere n’eluigwe, n’asị na ọ bụ nduhie iji dufue ha. Ihè ahụ gabigara ha, e wee rapụ ha n’ọchịchịri. Ndị niile nataworo ihè ahụ sitere na Jisọs, jiri ọñụ narakwa iba-ụba nke ihè ahụ dị oke ọnụ-ahia a wakwasịrị ha. Iru ha nwupụrụ ihè, n’enwekwa ọñụ e doro nsọ, na mgbe iru ha chere n’ebe Jisọs nọ na nmasị dị ukuu, ka a nụkwara olu ha n’ịdị n’otu ha na olu nke mụọ-ozi ahụ, Tụa egwu Chineke ma nyekwa Ya otuto, n’ihi na oge-awa nke ikpe Ya a biawo. Ka ha n’etiku mkpu nka, a hụrụ m ndị ahụ nọ n’ọchịchịri ka ha n’akwa ha akụkụ na akwakwa ha ngụ. Mgbe ahụ ọtụtụ n’ime ndị ahụ hụrụ ihè-nsọ ahụ n’anya, dọbiri ụdọ ahụ tụhịkọrọ ha, ma pụa guzoro iche site n’ọgbakọ ndịa. Ma dịka ọtụtụ n’adọbi ụdọ ndịa kekọtara ha, ndị nọ n’ime ọgbakọ ndịa dị iche-iche, ndị ha n’asọpụrụkwa, jegharịrị n’ọgbakọ ndịa, ma ụfọdụ n’eji okwu ụtọ ha dị iche-iche, ma ndị ọzọ kwa n’eji anya-ụfụ na omume nke iyi-egwù, n’ekesikwa ụdọ ahụ ike bụ nke n’adọbi-adọbi, wee nọgịde mgbe niile n’asị, Chineke diyere anyị. Anyị n’eguzo n’ihè. Anyị nwere ezi-okwu ahụ. A jụrụ m ndị madụ ndị ahụ bụ. A gwaram na ha bụ ndị na eje ozi, ndị n’edu edu, ndị juworo ihè ahụ n’onwe ha, ma ha a chọghịkwa ka ndị ọzọ nara ya. A hụrụ m ndị niile hụrụ ihè n’anya ka ha ji nmasị n’ele anya ma nwekwa ọchịchọ sịrị ike n’ihe dị n’elu, n’eche ka Jisọs bia kpọrọ ha nye onwe Ya. N’oge n’eteghị anya igwe oji gabigara n’isi ndịa niile ñụrịrị ọñụ n’ime ihè ahụ, ma iru ha gbarụrụ agbarụ. A jụrụ m ihe kpatara igwe oji nka. E gosịrị m na ọ bụ nkpọchụ-iru ha. Oge mgbe ha lere anya onye-nzọpụta ha a gafewori, ma Jisọs a biaghị. Obi ọlila-azụ dakwasịrị ha, ma ndị ahụ niile m hụworo na mbụ, bụ ndị ahụ n’eje ozi na ndị na edu-edu, ñụrịrị ọñụ. Ndị niile jụworo ihè ahụ, meriri nke ukuu, mgbe Ekwensu na ndị mụọ-ọjọọ ya gbara ha gburu-gburu n’ọñụ nke nmeri.NUA 150.1
Mgbe ahụ m we nụ olu nke otu mụọ-ozi ọzọ, ka ọ n’asị, Babilon adawo! Ọ dawo! Ihè chawapụtara nye ndị ahụ n’ada mba, ma sitekwa n’ọchịchọ ha sịrị ike banyere ọbịbịa ya, ha legịdekwara anya ha ọzọ na Jisọs. Mgbe ahụ m wee hụ ọnụ-ọgụgụ ndị mụọ-ozi ọzọ ka ha nọ n’akparite ụka ha na mụọ-ozi nke abụa ahụ, onye tiworo mkpu, Bibilon adawo, ọ dawo, ma ndị mụọ-ozi ndịa weliri olu ha tikwasi nke mụọ-ozi nke abụa ahụ, wee tie-mkpu, lee onye ahụ nke n’alụ nwụnye ọhụụ ka ọ n’abia! Pụa nụ je zute ya! Ụda olu abụ nke ndị mụọ-ozi ndịa dịka o rutere ebe niile. Oke ihè ukuu nke dịkwa ebube chawara gburu-gburu ndị niile jidere ihèe ahụ nke e nyeworo ha. Iru ha n’enwụkwa site n’ịmabiga mma oke nke ebube, na ha niile sokọrọ ndị mụọ-ozi n’iti-mkpu ahụ, Lee, onye ahụ nke n’alụ nwụnye ọhụụ na abia! Ma dịka ha weliri olu ụtọ ha n’iti-mkpu ahụ n’etiti ọgbakọ ndịa dị iche-iche, ndịa niile jụrụ ihè ahụ, kwara ha aka, ma sitekwa n’anya ụfụ, kwa ha emo ma meekwa ha ihe-ọchị. Kama ndị mụọ-ozi nke Chineke gbasara nku ha n’ebe ndị a n’akpagbu nọ, mgbe Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya nọ n’achọ ikwanye ọchịchịrị ha gburu-gburu, iduru ha ka ha jụ ihè ahụ nke sitere n’eluigwe.NUA 151.1
Mgbe ahụ a nụrụ m olu nke n’asị ndị ahụ a kwara aka ma meekwa ihe-ọchị, si nụ n’ime ha pụta, ma e metụkwala ihe n’adịghị ọcha aka. Ọnụ-ọgụgụ buru ibu dọbiri ụdọ ahụ niile kekọtara ha, ma ha ñakwara nti n’olu ahụ, ma rapụ ndị ahụ nọdụrụ n’ime ọchịchịrị, wee bia dịrị n’otu ha na ndị ahụ dọbiworo ụdọ na mbụ, ha niile wee were ọñụ jikọta olu ha n’otu. A nụrụ m olu-ekpere nke sitere n’obi-mgbu site n’ọnụ madụ ole na ole ndị fọdụkwara n’ọgbakọ ndị ahụ nọ n’ọchịchịrị. Ndị n’eje ozi na ndị n’edu edu n’ejegharikwa n’ime ọgbakọ ndị a, n’ekesikwa ụdọ ndịa ike karị; kama a nọgịdikwara m n’anụ olu-ekpere a sịrị ike. Mgbe ahụ a hụrụ m ndịa nọgịdere n’ekpere ka ha tipụtara aka ha n’ihi enyemaka n’ebe ọgbakọ ahụ dị n’otu nke nwekwara onwe ha, nke n’añurịkwa n’ime Chineke. Ọziza nke sitere n’ebe ha nọ, ka ha n’elegịdesi anya ike n’eluigwe, ma na atụkwa aka n’elu, bụ, Si nụ n’ime ha pụta, nọrọkwa iche. A hụrụ m madụ dị iche-iche ka ha n’agbasi mgba ike inwere onwe ha, ma n’ikpeazu ha dọbikwara ụdọ ahụ niile kegịdere ha. Ha gbara mgba megide ọlụ niile a lụrụ iji kesie udo ahụ ike, ha a ñ’aghịkwa ntị n’okwu nkwa niile ndịa, Chineke dinyere anyị, Anyị onwe-anyị nwere ezi-okwu ahụ. Madụ dị iche-iche nọgịdere n’arapụ nzukọ ahụ nọ n’ọchịchịrị, wee n’ejekuru nzukọ ahụ nke nwere onwe ha, ndị dịka ha nọ na mbara-ogịge e weliri elu. Ha n’elegịde anya ha n’elu, ma ebube nke Chineke dịkwasikwara ha, ha wee tikue mkpu n’otuto nke Chineke. Ha dịwara n’otu, dịkwa ka e jiri ihè nke eluigwe gbaa ha gburu-gburu. Na gburu-gburu ọgbakọ nka bụkwa ndị biara site na nhụku nke ihè ahụ, kama ha abụghị ndị ha na ọgbakọ ahụ dị n’otu. Ndị niile natara ihè ahụ wakwasịrị ha ji nmasị dị ukuu n’elegịde anya n’elu. Jisọs lekwasikwara ha anya nke ihe ụtọ Ya. Ha lere anya ka Jisọs bia. Ha legịdere anya ọbịbịa Ya. Ha eledaghịkwa anya ọbụla n’ụwà. Ọzọkwa a hụrụ m igwe oji ka ọ n’anọkwasi ndị ahụ n’echere. A hụrụ m ka ha tụgharịrị anya ha ike gwuworo wee leda n’àlà. M we jụa ihe kpatara ngbanwe nka. Mụọ-ozi nke mụ na ya n’ejekọ wee si, ha e nwetawọkwa mkpọchụ-iru ọzọ n’olileanya ha. Jisọs apụghị ibia n’ụwà ugbua. Ha aghaghị ihụkwa ahụhụ ọzọ n’ihi Jisọs ma nagịdekwa ọnwụnwa ndị karịrị. Ha aghaghị ịrapụ ezighị-ezi niile na omen’àlà niile nke ha natara n’aka madụ, ma chigharịkute Chineke n’okwu ya n’ozuzu-oke. A ghaghị ime ka ha dị ọcha, bụrụkwa ndị a nụchara anụcha. Ma ndị niile nagịdere mkpagbu a dị ilu g’enweta nmeri ebighị-ebi.NUA 152.1
Jisọs a biaghị n’ụwà mgbe ọgbakọ ahụ ji ọñụ n’echere ya, ihichapụ ebe nchụ-aja, site n’iji ọkụ mee ka elu-ụwà dị ọcha. A hụrụ m na ha meziri emezi na ngbakọ oge nke amụma niile. Oge nke amụma mechiri na 1844. Nmejo ihe ha gbanyere na a ghọtaghị ihe ebe nchụ-àjà ahụ bụ, na oọịdị nke nhicha ya. Jisọs banyere n’ebe nsọ nke kachasi ebe nsọ ihicha ebe nchụ-àjà n’ogwụgwụ nke ụbọchị ndịa. E legịdekwara m ọgbakọ ahụ n’echere, nke nwekwara mkpọchụ-iru. Ha nwere mgbarụ iru. Ha jiri mkpachara-anya nyochaa ihe-ngosi niile nke okwukwe ha, ma sorokwa mgbakọ nke oge niile nke amụma, ma ha a chọpụtaghịkwa nmejọ ihe ọbụla. Oge ka emezuworo, ma olee ebe onye-nzọpụta ha nọ? Ha etufuwo ya.NUA 154.1
Mgbe ahụ e gosịrị m mkpọchụ-iru nke ndị n’eso ụzọ ya mgbe ha biaruru ili ahụ ma ha ahụghị arụ Jisọs. Meri wee si, e bupuwo ha onye nwem, ma a mataghịkwa m ebe ha tọgbọrọ Ya. Ndị mụọ-ozi gwara ndị n’eso ụzọ ya n’eri-uju na Onyenwe ha e biliwo, na o n’ebu ha ụzọ jerue Galili.NUA 154.2
A hụrụ m na dịka Jisọs ledatara anya n’arụ ndịa nwetara nkpọchụ-iru site n’obi-ebereị dị omimi, o zigara ndị mụọ-ozi ya iduzi uche ha ka ha nwe ike chọta ya, ma sorokwa ya n’ebe ọ nọ; ka ha nwe ike ighọta na ụwà abụghị ebe nchụ-àjà ahụ; na ya onwe ya a ghaghị ibanye n’ebe nsọ kachasi ebe nsọ nke ebe nchụ-àjà nke eluigwe ihicha ya; ime udo pụrụ iche nye Izrel, na inara àlà-eze nke Nna ya, ma lọghachikwa n’ụwà ikpọrọ ha ka ya na ha biri mgbe ebighị-ebi. Mkpọchụ-iru nke ndị n’eso ụzọ ya nọchiri anya nke ọma, ụdị mkpọchụ-iru nke ndị ahụ lere anya onyenwe ha na 1844. E kuuru m laghachi azụ n’oge mgbe Kraist gbara ịnyịnya na nmeri wee banye n’ime Jerusalem. Ndị n’eso ụzọ ya na añụrị ọñụ kwenyere na Ọ g’ewere àlà-eze ahụ mgbe ahụ, ma chiakwa n’ụwà dịka eze. Ha sooro eze ha n’olileanya dị elu. Ha gbutusiri igu-nkwu hà mara mma, ma yipụkwa uwe ha, ma sitekwa n’obi ọñụ gbasaa ha n’okporo-ụzọ; ma ụfọdụ n’aga n’iru, ndị ọzọ n’esokwa n’azu n’eti mkpu, otuto dịrị nwa Devid! Ngọzi n’adịrị onye ahụ nke n’abia n’aha Onyenwe-anyị! Otuto n’ebe kachasị elu! Nkpali dị otua sogburu ndị Farisii, na ha chọrọ ka Jisọs bara ndị n’eso ụzọ ya mba. Kama ọ sịrị ha, Ọ bụrukwa na ndịa g’emechi ọnụ ha, ọbụna nkume g’etipụkwa mkpu. Okwuamụma nke Zekarịa 9:9, a ghaghị imezu, ma otu ọdị, a hụkwara m, na ndị n’eso ụzọ ya dabara na nkpọchụ-iru dị ilu. N’abali ole na ole ha sooro Jisọs jerue Kalvari, ma hụkwa ya ka Ọ n’awụsị ọbara n’ebe a hịkọtara ya n’elu obe ọjọọ ahụ. Ha hụrụ ọnwụ nhụju-anya ya, ma tọgbọkwa ya n’ili. Obi ha dakpuru n’ime iri-uju. Nzube ha niile adịghị nke ọbụla mezuru m’oli. Olileanya ha sokọrọ Jisọs nwụa. Ma dịka o si na ndị nwụrụ-anwụ bilie, ma pụtakwa ihè n’etiti ndị n’eso ụzọ ya n’eri-uju, olileanya ha tutekwara. Onyenwe ha e punariwo ha; ma ha a chọtawọkwa ya ọzọ.NUA 155.1
A hụrụ m na mkpọchụ-iru nke ndị ahụ kweworo n’ọbịbịa nke Onyenwe-anyị na 1844, erughịkwa ka mkpọchụ-iru nke ndị n’eso ụzọ ya. Okwu nke amụma mezuru n’ozi nke mụọ-ozi nke mbụ na nke abụa. Enyere ha n’oge dị nma, ma luzuekwa ọlụ nke Chineke doziiri ha ịlụ.NUA 156.1