Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 35—Ozi Nke Ato Ahụ Mechiri

    ATụụrụ m aka rue n’oge mgbe ozi mụọ-ozi nke atọ ahụ n’emechi. Ike nke Chineke a nọkwasiwọkwa ndị ya. Ha a luzuwokwa ọlụ ha, ma nọrọkwa na njikere nye oge-awa ọnwụnwa ahụ chere ha n’iru. Ha a natawokwa miri-ozuzo nke ikpeazụ ahụ, m’ọbụ nwugharị ọhụụ nke sitere n’iru Onyenwe-anyị, na ezi-àmà ahụ dị ndụ ka a tutekwara. Idọ-aka na ntị ukuu nke ikpeazụ ahụ adawo ebe niile, ọ kpaliwọkwa ma kpasuekwa ndị bi n’elu ụwà iwe, ndị n’adịghị anara ozi ahụ.NUA 209.1

    A hụrụ m ndị mụọ-ozi ka ha ji ọhụhụ n’ejegharị n’ime eluigwe. Otu mụọ-ozi lọtara site n’ụwà, na ejide ihe ode-akwụkwọ n’akụkụ ya, ma kọọrọ Jisọs na ya a lụzuwo ọlụ ya, na a gụwo ndị-nsọ niile ọnụ ma kaakwa ha ákàrà. Mgbe ahụ A hụrụ m Jisọs, onye nọrị n’eje ozi n’iru igbe ahụ e tinyere iwu-iri Chineke, ka ọ wụsara ihe nsure-ọkụ ahụ n’esi isi-ụtọ. O wee welie aka ya abụa elu, ma were oke-olu sị, e mewo ya. Ụsụụ ndị mụọ-ozi niile wee kpupụ okpu-eze ha mgbe Jisọs mere nkwupụta ahụ dị nro, onye n’eme ajụọ-omume, ka o mee ajụọ-omume ya gaa n’iru; onye rukwara inyi, ka o rue inyi gaa n’iru; onye ezi-omume, ka o mee ezi-omume gaa n’iru; onye dịkwa nsọ, ka ọ dị nsọ gaa n’iru.NUA 209.2

    A hụrụ m na ikpe ọbụla ka e kpebiworo mgbe ahụ nye ndụ m’ọbụ ọnwụ. Jisọs ehichawo nmhehie niile nke ndị Ya. Ọ narawo àlà-eze Ya, nkpuchi-nmehie ka o nwekwara nye nkpụrụ niile nke àlà-eze Ya. Mgbe Jisọs n’eje ozi n’ebe nsọ ahụ, ikpe n’agakwarị n’iru n’isi ndị ezi omume nwụru-anwụ, na n’isi ndị ezi omume dị ndụ. Nkpụrụ niile nke àlà-eze ka e mejupụtara. Ọlụlụ dị na nwụnye nke nw’atụrụ ahụ gwusịrị. Ma ala-eze ahụ, ịdị ukuu nke àlà-eze ahụ n’okpuru eluigwe niile, ka e nyere n’aka Jisọs, na ndị nketa nke nzọpụta, ma Jisọs bụ onye g’achị dịka Eze nke ndị-eze niile, na Onyenwe nke ndị-nwe niile.NUA 209.3

    Ka Jisọs pụtara site n’ebe nsọ nke kachasị ebe-nsọ, a nụrụ m ụda mgbarimgba niile dị n’ihe ngbọkwasị ya, ma ka ọ rapụrụ, igwe-ọchịchịrị kpuchiri ndị niile bi n’elu ụwà. Mgbe ahụ ọ dighịkwa onye-ogbugbo dị n’etiti madụ ikpe mara, na Chineke onye e mehiere. N’oge Jisọs guzoworo n’etiti Chineke na madụ ikpe mara, ebere dịnyere ndị madụ; ma mgbe Jisọs zọpụrụ ụkwụ site n’etiti madụ na Nna ahụ, ebere ka e wepụkwara, Ekwensu wee buru onye n’atụrụ madụ ụka! Ọ bụghị ihe kwere omume ịwusa ihe otiti ndịa n’oge mgbe Jisọs n’eje ozi n’ebe nchụaja ahụ; ma dịka ọlụ ya gwụsịrị ebe ahụ, dịka nkwuchite-ọnụ ya mechiri, ọ dịghịkwa ihe pụrụ igbochi iwe nke Chineke, nke n’etiwakwa n’ike n’isi onye nmehie ikpe mara, onye mere nzọpụta ihe efu, ma kpọkwa ịba-mba asị. Ndị nsọ niile n’oge ahụ dị oke egwu, na nmechi nke ọlụ ogbugbo Jisọs, n’ebi ndụ n’iru Chineke dị nsọ, n’enweghị onye n’arịọtara ha arịrịọ. Ikpe niile ka e kpebiri, ihe oke ọnụ-ahia ọbụla ka a gụrụ-ọnụ. Jisọs nọdụrụ nwa oge n’ụlọ mpụta nke ebe-nsọ nke eluigwe, na nmehie niile nke e kwupụtaworo mgbe ọ nọ n’ebe-nsọ kachasi ebe-nsọ, ka o bughachiri n’isi onye ahụ kpatara nmehie, bụ Ekwensu. O ghaghị ịta ahụhụ nke nmehie ndịa niile.NUA 210.1

    Mgbe ahụ A hụrụ m Jisọs ka O yipụrụ uwe nchụ-àjà ya, ma yikwasị onwe ya n’oke uwe nwụda ukuu onye-eze n’elu isi ya, ka ọtụtụ okpu-eze n’anọkwasịkwa, otu okpu-eze n’ime okpu-eze ma igwe ndị mụọ-ozi gbara ya gburu-gburu, ka ọ rapụrụ eluigwe. Ihe otiti ndị ahụ n’adakwasikwa ndị bi n’elu ụwà. Ụfọdụ n’ekwụtọ Chineke, n’abụkwa ya ọnụ. Ndị ọzọ gbakuuru ndị nke Chineke, ma riọ ka ezi ha otu ha g’esi gbanarị ikpe niile nke Chineke. Kama ndị-nsọ e nweghị ihe ọbụla nye ha. E hiworị anya miri ikpeazu n’ihi ndị nmehie, ekpere obi ntiwa ikpeazu ka e kpewọkwaara ha, ibu nke ikpeazu ka e buwọkwara. Olu ụtọ nke obi-ebere agaghị akpọkwa ha ọzọ. Okwu ịdọ-aka na ntị nke ikpeazụ ka e nyeworo rị. Mgbe ndị-nsọ, na eluigwe niile nwere nmasị n’ihi nzọpụta ha, ha egosighịkwa nmasị ọbụla n’ihi onwe ha. Ndụ na ọnwụ ka e cheworo n’iru ha. ọtụtụ chọrọ ndụ, kama ha alụghị ọlụ ọbụla inweta ya. Ha ahọrọghị ndụ, ma ugbua ọ dịghịkwa ọbara nkpuchi-nmehie nke e ji ehicha onye nmehie. Ọ dịghịkwa onye-nzọpụta obi-ebere g’ariọtara ha arịrịọ, iti-nkpu n’isi ha, rapụ, rapụ onye nmehie a nwa-ogologo oge ọzọ. Eluigwe niile ejikoworị aka ha na Jisọs, ka ha nụrụ nkpụrụ okwu ndịa n’atụ ụjọ; e mewo ya, o gwụsiwo. Atụmatụ nke nzọpụta abụrụwo ihe emezuru. Ma ole na ole nabatara atụmatụ ahụ. Ma dịka olu ụtọ nke obi-ebere ahụ na akwụsị ịda, oke ụjọ jidere ha. Site na ụda dị egwu ka nti ha nụrụ, Oge agafewo! Oge agafewo!NUA 211.1

    Ndịa niile n’ejighị okwu Chineke kpọrọ ihe jiri ọhụhụ na agbagharị iru na azu. Ha kpagharịrị site n’osimiri rue n’osimiri ọzọ, ma site n’ugwu rue ọwụwà-anyanwụ, ichọ okwu Onyenwe-anyị. Mụọ-ozi ahụ sịrị, ha agaghịkwa achọta ya. Ụnwụ dị n’àlà; ọbụghị ụnwụ nke ogbe-achịcha, m’ọbụ nke akpịrị miri-ọñụnụ, kama nke ịnụ okwu Onyenwe-anyị. Ọ bụ gịnị ka ha n’agaghị enye n’ihi otu nkpụrụ-okwu Chineke nabatara? Kama e-e, ha aghaghị inọgịde n’agụọ na akpịrị-ịkpọ nkụ. Site n’ụbọchị rue n’ụbọchị ka ha mere nzọpụta ihe-efu, ma were ihe ụtọ nke ụwà, na akụ-n’ụba nke ụwà, kpọrọ ihe dị elu kama ihe nke eluigwe na akụ n’ụba ya. Ha ajụwo Jisọs, ma meekwa ndị-nsọ Ya ihe ọchị. Onye ruru inyi aghaghị inọgịde n’iru-inyi rue ebighị-ebi.NUA 212.1

    Ndị karịrị n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ajụọ-omume ka a kpasuru iwe nke ukuu, ka ha tara ahụhụ nke sitere n’ihe otiti ndịa. Ọ bụ ọnọdụ nke obi-ilu dị egwu. Ndị nne na Nna n’ama ụmụ ha ụta, ma ụmụ n’amakwa ndị nwe ha ụta, ụmụnne-nwoke megide ụmụnne-nwanyị, na ụmụnne-nwanyị megide ụmụnne-nwoke. Iti mkpu-akwa ka a n’anụkwa nakụkụ niile, ọ bụ gị gbochiri m ịnara ezi-okwu ahụ, nke ga azọpụtarị m site n’oge ọjọọ nka. Ndị madụ tụgharịrị n’ebe ndị-ozi nọ na nkpọrọmasị dị ilu, n’ata ha ụta, n’agwa ha, ị dọghị anyị aka na ntị. Igwara anyị na ụwà niile ka a g’eme ka ha chagharia, ma tiekwa nkpu sị, udo, udo, ime ka ụjọ niile nke a kpaliri dajụa. I gwaghị anyị banyere oge-awa nka, ma ndị dọrọ anyị aka na ntị banyere ya ka unu sịrị na ha bụ ndị ọjọọ, na ndị nmehie, ndị ga ebibi anyị. Kama ndị-ozia niile, ka m hụrụ, agbanarịghị iwe nke Chineke. Nhụju-anya nke ha dị okpukpu-iri karị nke ndị ọzọ.NUA 212.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents