Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 19—Ọnwụ, Ọ bụghị Ndu Ebighị-ebi N’ime Ahụhụ

    Ekwensu malitere nduhie ya n’Iden. Ọ gwara Iv, ị gaghị anwụ m’ọli. Nka bụ ozizi mbụ nke Ekwensu banyere anwụghị anwụ nke nkpụrụ obi; o buruwokwa nduhie nka site n’oge ahụ rue ugbua, o ga eburukwa ya rue mgbe ndọta n’oru nke ụmụ Chineke g’abụ ihe a tụgharịrị. A tụụrụ m aka n’ebe Adam na Iv nọ n’Iden. Ha riri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ a gwara ha e rila, ma mgbe ahụ e dotekwara mma-agha ire-ọkụ ahụ gburu-gburu osisi nke ndụ ahụ, ma a chụpụkwara ha site n’ogịge ahụ, ka ha ghara irikwa mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ, ma bụrụ ndị nmehie n’adịghị anwụ anwụ. Osisi nke ndụ ahụ bụ ime ka anwụghị anwụ dị. A hụrụ m otu mụọ-ozi ka o jụrụ si, ọ bụ onye n’ime ezi-n’ụlọ Adam gabigara mma agha ire-ọkụ ahụ, ma riekwa mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ? M wee nụ olu mụọ-ozi ọzọ ka a zara si, ọdịghị otu onye sitere na ezi-n’ụlọ Adam gabigaworo mma-agha ahụ, n’egbuke egbuke, ma riekwa mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ, n’ihi nka ọdịghị onye nmehie ọbụla n’adịghị anwụ anwụ dị. Nkpụrụ obi ọbụla nke mehiere ga anwụ ọnwụ ebighị-ebi. Ọnwụ nke g’anọgịde ebighi ebi, ebe olile anya nke mbilite n’ọnwụ n’agaghị a dị; mgbe ahụ ka a g’emejụ iwe nke Chineke.NUA 115.1

    Ihe iju-anya ka ọ bụworo nye m na Ekwensu pụrụ imeri nke ọma n’ime ka ụmụ madụ kwenye na okwu Chineke, nke sị na nkpụrụ obi ọbụla nke mehiere ga anwụ, pụtara na nkpụrụ obi ọbụla nke mehiere agaghị anwụ, kama ọ g’adi ndụ ebighị-ebi n’ime nhụju-anya. Mụọ-ozi ahụ sịrị, ndụ bụ ndụ, m’ọbụ n’arụ-ufu m’ọbụ n’obi-ụtọ. Ọnwụ enweghị ihe mgbu, nweghịkwa ọñụ, nweghịkwa ikpọ asị.NUA 116.1

    Ekwensu gwara ndị mụọ-ozi ya ka ha lusie ọlu ike ịgbasa nduhie na ụgha ahụ nke o kwụghachiri na mbụ nye Iv n’Iden sị, ị gaghị anwụ m’oli. Ma dịka ndị madụ nabatara okwu ụgha ahụ, ma kwerekwa na madụ adịghị anwụ anwụ, Ekwensu dukwara ha gaa n’iru ikwenye na onye nmehie g’adị ndụ n’ime nhụjuanya ebighị-ebi. Mgbe ahụ e doziri ụzọ nye Ekwensu ịlụ ọlụ site na ndị nnochite anya ya. Ma gosi Chineke n’iru ndị madụ dịka onye nmegwa aka-ike; na ndị niile n’emeghị ihe n’atọ ya ụtọ, ka ọ g’atụnye n’ọku àlà-mụọ, ma meekwa ka ha nọgịde mgbe niile n’ime iwe ya, ka ha wee taa ahụhụ n’ihe mgbu nke ọnụ n’apụghị ịkọ, mgbe ọ g’enwekwa ojuju afọ na ile ha anya ka ha n’ata ikiri-eze n’ime oke arụ-ụfụ. Ekwensu matara na ọ bụrụ na a g’anabata okwu ụgha nka, ọtụtụ madụ g’atụ Chineke ụjọ ma kpọkwa ya asị, kama ihụ ya n’anya na ile ya anya ọma; na a g’edurukwa ọtụtụ madụ ikwenye na ịba-mba niile nke okwu Chineke agaghị emezu n’anụ-arụ; n’ihi na ọ g’emegịde ọdịdị ya nke bụ obi-ebere na ihụnanya, ịkwanye ndị O kere eke n’ime nhụju-anya ebighị-ebi. Ekwensu e duruwo ha rue ụsọtụ ọzọ, na ilepụ anya n’ikpe ziri ezi nke Chineke, na iba-mba niile nke dị n’ime okwu ya, ma werekwa ya dịka onye bụ naanị ebere na ọ dịghịkwa otu onye ọbụla ga-àlà n’iyi, kama madụ niile, ndị nsọ na ndị ajụọ-omume, g’abụ ndị a zọpụtara na àlà-eze ya. N’ihi nlụpụta nke okwu ụgha ahụ pụtara ihè bụ anwụghị anwụ nke nkpụrụ-obi, na ntaramahụhụ agwụghị-agwụ, Ekwensu nwetara ndị ọzọkwa, ma durukwa ha iwere akwụkwọ-nsọ dịka akwụkwọ n’esiteghị n’obi Chineke. Ha chere na ọ n’akuzi ezi ọtụtụ ihe dị mma; kama ha a pụghị ịdabere na ya ma hụ ya n’anya; n’ihi na a kuziworo ha na ihe ọ n’ekwupụta bụ ụkpụrụ nke ntaramahụhụ ebighi-ebi.NUA 116.2

    Ekwensu nwetakwara ndị ọzọ durukwa ha, ga n’iru igọnarị ịdị-adị nke Chineke. Ha ahụtaghị inwe out-olu n’agwa Chineke nke akwụkwọ-nsọ, m’ọbụrụ na o g’eme ka ụfọdụ ụmụ madụ taa ahụhụ ebighị-ebi; ha wee gọnarị akwụkwọ-nsọ na onye nyere ya, ma were ọnwụ dịka ịrarụ ura ebighị-ebi.NUA 118.1

    Mgbe ahụ Ekwensu duuru òtù ọzọkwa ndị ụjọ banye ime nmehie; ma mgbe ha mesịrị nmehie, ọ n’egosikwa ha na ụgwọ-ọlụ nke nmehie a bụghị ọnwụ, kama ndụ ebighị-ebi n’ime oke ntaramahụhụ, nke a g’enwe ntachi-obi na ya ogololgo ụbọchị niile nke ndụ. Ekwensu na ahazikwa ohere ya nke ọma, n’emekwa ka ọsaa mbara n’ime obi ndị dara mba ahụhụ niile nke ọkụ àlà-mụọ ebighị-ebi, ma jidekwa akọ-n’uche ha, ha wee tufue echiche ha. Mgbe ahụ Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ñụrịrị n’ime nmeri, ma ndị n’ekweghị ekwe na ndị n’amaghị Chineke jikọrọ aka ikwujọ okpukperechi nke Kraist. Ha were nlụpụta sitere na nkwenye nke akwụkwọ-nsọ na onye dere ya.NUA 118.2

    A hụrụ m na ụsụụ ndị eluigwe jupụtara na ọnụma banyere ọlụ anya-ike dị otua nke Ekwensu. A juru m ihe mere e ji kwenye ka ndahie ndịa niile nwee ike n’obi madụ, mgbe ndị mụọ-ozi nke Chineke siri ike dị, nke bụ asi na e ziga ha, o dịrị ha mfe ịla ike nke onye-iro ahụ n’iyi. Mgbe ahụ a hụrụ m na Chineke matara na Ekwensu g’agbali ụzọ niile ịla ndụ madụ n’iyi; n’ihi nka ka o mere ka e depụta okwu ya, ma meekwa ụzọ ya niile ka o wee anya nke ọbụna onye dakasịrị mba ekwesighị idahie. Ma, mgbe o nyesịrị madụ okwu, o kpachakwaara anya ichekwa ya, ka Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya, site n’aka onye nnochite anya ya ọbụla, ghara ịla ya n’iyi. ọbụna mgbe akwụkwọ ndị ọzọ pụrụ ịla n’iyi, akwụkwọ nka g’adị anwụghị anwụ. Ma rue kwa nso ọgwụgwụ nke oge, mgbe nduhie niile nke Ekwensu g’aba ụba, akwụkwọ nka ka a g’amụbakwa, ka ndị niile chọrọ ya g’enweta akwụkwọ ahụ nke kpuhere uche Chineke nye madụ, ma, ọbụrụkwa na ha chọrọ, ka ha jikwaa onwe ha megide nduhie niile na ọlụ ebube ụgha niile nke Ekwensu.NUA 118.3

    A hụrụ m na Chineke chekwara akwụkwọ-nsọ ahụ n’ụzọ pụrụ iche, ma otu ọdị, ndị nwere nmụta, mgbe akwụkwọ ahụ dị ole na ole, gbanweworo nkpụrụ okwu ya n’ụzọ dị iche-iche, n’eche na ha n’eme ya ka o wekarị anya; mgbe ha n’emelu ihe ahụ nke wekwarari anya, n’ime ya ka ọ dabere na nghọta nke onwe ha, nke ome-n’àlà na achị. Kama a hụrụ m na okwu Chineke, n’ozuzu-oke ya, bụ iyagba zuru oke, otu nkega nke akwụkwọ-nsọ na akọwa nkega nke ọzọ. Ndị ji obi ha na achọ ezi-okwu ahụ ekwesighị idahie; n’ihi na ọ bụghị naanị na okwu Chineke dịkwa mfe nikowapụta ụzọ nke ndụ, kama e nyekwara Mụo-nsọ iduzi akọ-n’uche nụzọ nke ndụ ahụ e kpuhere n’ime okwu ya.NUA 119.1

    A hụrụ m na ndị mụọ-ozi Chineke adịghị mgbe ha g’atụrụ ọchịchọ madụ uka. Chineke debere n’iru madụ ọnwụ na ndu. Madụ pụrụ inwe nhoro nke aka ya. Ọtụtụ chọro ndu, ma nọrọkwa n’eje ije n’okporo-ụzọ ahụ dị obosara, n’ihi na ha adịghị ahọrọ ndụ.NUA 120.1

    A hụrụ m obi-ebere na ọmiko nke Chineke n’inye Ọkpara ya ka o nwụa n’ihi madụ ikpe mara. Ndị n’adịghị ahọrọ inara nzọpụta nke e jiri oke ọnụ-ahia dị otua zutara ha, ka a g’enye ntaramahụhụ. Ndị Chineke kere a họrọwo inupu-isi megide ọchịchị ya; kama a hụrụ m na Chineke emechibidoghị ha ụzọ na ọkụ àlà-mụọ inagịde ọnọdụ-ọjọọ ebighị-ebi. Ọ gaghịkwa akpọrọ ha la eluigwe; n’ihi na ikpọta ha n’ime ọgbakọ ndị dị ọcha dịkwa nsọ, g’eme ha obi ezughị ike n’ụzọ niile. Chineke a gaghị akpọru ha eluigwe, ma ọ gaghịkwa e me ka ha taa ahụhụ ebighị-ebi. Ọ g’ebibi ha n’ozuzu-oke, ma meekwa ha ka ọ dịghị mgbe ha diworo, mgbe ahụ ka ikpe ezi omume ya g’emezu. O kere madụ site n’aja nke àlà, ma ọkụ g’erechapụ ndị n’adịghị ege nti na ndị n’adịghị nsọ, ha g’alaghachikwa n’aja-àlà ọzọ. A hụrụ m na nmeso oma na obi-ebereị nke Chineke na nka, g’eduru madụ niile inwe nmasị n’omume ya, na ichọ ya mma; ma mgbe a lasịrị ndị nmebi-iwu n’iyi pụa n’ụwà, ụsụụ niile nke eluigwe g’asikwa, Amen!NUA 120.2

    Ekwensu jiri obi-ụtọ legịde ndị ahụ niile n’akpọ áhà Kraist, ma bụrụkwa ndị n’agbaso ụzọ nduhie niile ndịa nke ya onwe ya mepụtara. Ọlụ ya bụ imepụtakwa ụzọ nduhie ọhụụ ndị ọzọ dị iche-iche. Ike ya na amụbakwa, o na etọkwa eto nụzọ aghụghọ ya niile. O duuru ndị nọchitere anya ya na aga n’iru, ndị Pop na ndị nchụ-àjà , ibuli onwe ha elu, na ikpali ndị madụ ka ha kpagbue ndị ahụ niile hụrụ Chineke n’anya, bụ ndị n’adịghị enye onwe ha na nduhie ahụ niile, e sitere n’aka ha wepụta. Ekwensu banyere n’obi ndị ọlụ ya ibibi ndị niile n’eso ụzọ Kraist n’ikwesi ntụkwasị-obi. O le ka ọdị bụ ntaramahụhụ na iri-uju, nke ha mere ndị ahụ dị oke ọnụ-ahia nke Chineke inagịde! Ndị mụọ-ozi edebawo ihe ndịa niile n’akwụkwọ n’ụzọ eziokwu. Ma Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya ñụrịrị ọñụ nmeri, ma gwakwa ndị mụọ-ozi n’elekota, n’agbakwa ndị nsọ ahụ niile n’ahụju anya ume, na ha g’egbukwa ha, nke na ọ gaghị a dịkwa otu ezi onye nke Kraist n’elu ụwà. A hụrụ m na nzukọ Chineke dịkwara ọcha mgbe ahụ. Ọ dịghị ihe ọghọm nke ụmụ madụ e merụrụ emerụ n’obi ibata n’ime nzukọ nke Chineke dị n’oge ahụ; n’ihi na ezi onye nke Kraist ọbụla, onye kwupụtara okwukwe ya, nọkwari n’ihe ọghọm nke ibipụ-isi ya m’ọbụ ikwụba ya n’osisi, na ntaramahụhụ ọbụla nke Ekwensu na ndị mụọ-ọjọọ ya pụrụ imepụta, ma tinyekwa ya n’obi madụ.NUA 121.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents