Isi Nke 27—Ebe-Nsọ Ahụ
Mgbe ahụ e gosịrị m mkpọchụ-iru ọjọọ ahụ nke ndị nke Chineke. Ha ahụghị Jisọs n’oge a tụrụ anya ya. Ha a mataghị ihe mere onye-nzọpụta ha abiaghị. Ha a hụghịkwa ihe ngosi ọbụla mere oge nke amụma jiri biarughị ọgwụgwụ. Otu mụọ-ozi wee si, ọ bụ na okwu Chineke a dawo? Ọ bụ na Chineke a dawo n’imezu nkwa ya niile? E-e: o mezuwo nkwa niile nke o kwere. Jisọs e biliwo, ma o mechiwọkwa ọnụ-ụzọ ebe nsọ nke nchụ-àjà nke eluigwe, ma o meghewokwa otu ụzọ bara n’ebe nsọ kachasị ebe nsọ, ma Ọ bawọkwa n’ime ihicha ebe nchụaja ahụ. Mụọ-ozi ahụ wee sị, ndị niile ji ntachi-obi chere g’aghotakwa ihe omimi a. Ọ bụ madụ dahiere; kama ọ dịghị mgbe ndahie ọbụla dị n’akụkụ nke Chineke. Ihe niile ka e mezuru bụ nke Chineke kwere na nkwa; kama madụ sitere na nmejọ-ihe legịde elu ụwà anya, na ewere ya na ọ bụ ebe nsọ ahụ a g’edo ọcha n’ogwụgwụ-oge nke amụma niile. Ebum-n’uche nke madụ adawo, kama ọ bụghị nkwa nke Chineke dara m’ọli. Jisọs zigara ndị mụọ-ozi ya iduzi ndị ahụ nwere nkpọchụ-iru, iduru echiche ha ba n’ime Ebe nsọ ahụ nke kachasị ebe-nsọ ebe o jeworo ime ka ebe-nchụaja dị ọcha, ma meekwa udo pụrụ iche n’ihi Izrel. Jisọs gwara ndị mụọ-ozi na ndị niile chọtara ya g’aghọta ọlụ a nke ya onwe ya g’alụ. A hụrụ m na mgbe Jisọs nọ n’ebe-nsọ ahụ nke kachasi ebe-nsọ, na a g’alụtara ya Jerusalem ọhụụ ahụ, ma na mgbe ọ lụsịrị ọlụ ya n’ebe-nsọ ahụ kachasi ebe-nsọ, ọ g’arịdata n’ụwà n’ike nke Onye-eze ma werekwa ndị ahụ dị oke ọnụ-ahia nye onwe ya, ndị jiworo ntachi-obi chere nlọghachi ya.NUA 164.1
Mgbe ahụ e gosịrị m ihe mere n’eluigwe mgbe oge nke amụma gwusịrị na 1844. A hụrụ m na mgbe ije-ozi nke Jisọs n’ebe nsọ gwusịrị, o wee kpọchie ụzọ ebe ahụ, oke ọchịchịrị dakwasịrị ndị niile nụworo, ma jụ ozi niile nke ọbịbịa Kraist, na ha ahụghịkwa ya. Mgbe ahụ Jisọs yikwasikwara onwe ya akwa dị oke ọnụ ahia. Gburu-gburu àlà-àlà nke uwe-nwụda ya bụ mgbaringba na ifiri-pomegranets, mgbarimgba na ifiri-pomegranets. Sitekwa na ngụ ya ka o yikwasịrị ihe mgbochi-obi nke ọlụ dị nkpa. O n’egbukekwa-egbuke, ka o n’eje ije, n’amụbakwa mkpụrụ okwu ndị yiri ka ọtụtụ áhà e dere, m’ọbụ a tụrụ atu n’elu ihe mgbochi-obi ahụ. Mgbe o yikwasịrị onwe ya ihe-mgbọkwasi zuru oke, tinyekwara ihe dị n’isi ya nke yiri okpu-eze, ndị mụọ-ozi gbara ya gburu-gburu, ma sitekwa n’ugbo-àlà ọkụ o wee gafee ihe mkpuchi nke abụa. Mgbe ahụ a gwara m ka m riba-àmà ọnụ-ụlọ abụa nke ebe nchụ-àjà nke eluigwe. Akwa-mgbochi ahụ, m’ọbụ ọnụ-ụzọ, ka e mehere, e kwekwara ka m banye. N’ime ọnụ-ụlọ nke mbu a hụrụ m oriọna ahụ n’ihe ndọba-oriọna asaa, nke bara ụba n’ile-anya dịkwa ebube; ọbụna tebul ebe ndọba nke achịcha iru-Chineke, n’ebe nchụ-àjà nke isi-ụtọ, na ihe nsure-ọkụ ya. Ihe niile nke dị n’ọnụ ụlọ a yiri dịka ezi ọla-edo, n’enwụpụtakwa oyiyi nke onye ahụ nke na abanye n’ime ebe ahu. Akwa-mgbochi ahụ nke kewara ọnụ-ụlọ abụa ndịa dịkwa ebube nke ukuu. Ọ bụ ihe nwere ụcha dị iche-iche, na ihe ọdụdụ dị iche-iche, na ihe ichọ-mma dị ya gburu-gburu nke e dekwasịrị ihe ọdịde nke ọla-edo n’elu ya, nke nọchiri anya ndị mụọ-ozi. E weliri akwa mgbochi ahụ, m wee leba anya n’ime ọnụ-ụlọ nke abụa ahụ. A hụrụ m n’ebe ahụ otù igbe nke nwere ụdi ezi ọla-edo. E jiri ihe ịchọ-mma mee gburu-gburu elu-igbe ahụ, nke nọchiri anya okpu-eze dị iche-iche. Ọ bụ ihe e ji ezi ọla-edo mee. N’ime igbe ahụ ka e tinyere mbadamba nkume ndịa jikọrọ iwu-iri ahụ. Nụsọtụ àkwà nke igbe ahụ ka cherub mara mma nọ gbasaakwa nkù ha n’elu-igbe ahụ. Nkù ha ka e weliri n’elu, na e metụkwa onwe ha n’elu isi nke Jisọs, ka ọ n’eguzo n’akụkụ igbe ahụ. Ha n’echekwa onwe ha iru, n’eledakwa anya ha n’igbe ahụ, nke nọchitere anya igwe ndị mụọ-ozi niile ka ha ji nmasị n’elegịde iwu Chineke anya. N’aghata Cherubim ndịa bụ ihe nsure-ọkụ ọla-edo ahụ. Ma dịka ekpere nke ndị nsọ n’okwukwe rigokuru Jisọs, na o chere ha n’iru Nna ya, isi-ụtọ n’apụta site na ihe ndọba ahụ. O yiri anwụrụ-ọkụ nke nwere ụcha dị iche-iche mabigara mma oke. N’elu ebe Jisọs n’eguzo, n’iru igbe ahụ, a hụrụ m ihe nke nwụbigara oke n’ebube nke m n’apụghị ilegịde anya. Ọ dịka àlà-eze ebe Chineke bi. Ma dịka ihe isi ụtọ ahụ n’arigokuru Nna, ebube dịkasịrị mma bikutere Jisọs site n’och’eze nke Nna, ma sitekwa na Jisọs, ọ wakwasịrị ndị niile ekpere ha gbagotere elu dịka ihe n’esi-isì ụtọ. Ihè n’ebube wụkwasịrị n’isi Jisọs n’uju ya, ma nwụkwasi ebe nkpuchi-nmehie ahụ, n’ahịrị nke ebube jupụtara ụlọ ukuu ahụ. A pụghịkwa m ilegịdesi ebube ahụ anya ike ọtụtụ oge. Ọ dịghịkwa asụsụ ọbụla pụrụ ikọwa ya. O juru m anya nke ukuu, m wee chigharia site n’ịdị ukuu na ebube nke ọnọdụ ahụ.NUA 165.1
E gosịrị m ebe nsọ n’elu ụwà nke nwere nkeg’abụa. O yikwara nke ahụ dị n’eluigwe. A gwara m na ọ bụ ebe-nsọ nke elu-ụwà, nke n’atụ aka nke eluigwe. Ihe niile dị n’ime nkega nke mbụ nke ebe-nsọ nke ụwà ahụ dịkwa ka ihe ndị ahụ nke dị na nke eluigwe. E weliri akwa mgbochi ahụ, m wee leba anya n’ime ebe-nsọ nke kachasi ebe-nsọ niile, ma hụkwa na ihe niile dị n’ime ya yikwara ndị ahụ dị n’ebe-nsọ nke kachasi ebe-nsọ niile nke dị n’eluigwe. Ndị nchụ-aja jekwara ozi n’ime nkega abụa nke ebe-nsọ nke elu-ụwà. N’ime nkega nke mbụ ka ọ n’eje ozi kwa ụbọchị n’ime afọ, ma banyekwa n’ebe nsọ nke kachasị ebe-nsọ naanị otu mgbe n’ime afọ, ime ka ọ dị ọcha site na nmehie niile nke e bugaworo n’ebe ahụ. A hụrụ m na Jisọs jere ozi n’ime nkega abụa nke ebe-nsọ nke eluigwe. Ọ banyere n’ime ebe-nsọ nke eluigwe site n’inye obara nke onwe ya. Ndị nchụ-àjà nke elu-ụwà ka a n’ewezuga site n’ọnwụ, n’ihi nka ha a pụghị inọgịde ogologo-oge; kama Jisọs, ka m hụrụ, dịka onye nchụ-àjà ebighị-ebi. Site na aja dị iche-iche na onyinye dị iche-iche e wetara n’ebe-nsọ nke elu ụwà, ụmụ Isrel n’ejide ezi-omume niile nke Onye-nzọpụta n’abia. Ma sitekwa na amamihe nke Chineke ihe niile banyere ọlụ a ka e nyekwara anyị ka anyị wee leghachi anya n’ebe ha nọ, ma ghotakwa ije ozi nke Jisọs n’ebe-nsọ nke eluigwe.NUA 168.1
N’obe, dịka Jisọs nwụrụ na Kalvarị, O tiri-mkpu sị, Ọ gwụwo, na akwa-mgbochi nke ebe-nsọ ahụ gbawara abụa, site n’elu rue àlà. Nka bụ igosi na ije-ozi niile nke ebe-nsọ nke elu-ụwà gwusịrị ebighị-ebi, na Chineke a gaghịkwa ezute ha ọzọ n’ebe nsọ ha nke elụ-ụwà, ịnara àjà ha dị iche-iche. Ọbara nke Jisọs ka a wụsịrị mgbe ahụ, nke ya onwe ya g’eji je ozi n’ebe-nsọ nke eluigwe. Ka ndị nchụ-àjà n’ebe-nsọ nke elu-ụwà banyere n’ebe-nsọ nke kachasi ebe nsọ ahụ otu ugbo n’afọ ime ka ọ dị ọcha, Jisọs banyekwara n’ebe-nsọ nke kachasi ebe-nsọ nke eluigwe, n’ogwụgwụ nke puku ụbọchị abụa na narị atọ nke Daniel 8, na 1844, ime udo ebighị-ebi nye ndị niile pụrụ irite uru na ọlụ nke ogbugbo ya, na ime ka ebe-nsọ ahụ dị ọcha.NUA 169.1