Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 2—Ọdịda Nke Madụ

    Ahụrụ m na ndị mụọ-ozi dị nsọ n’eleta ogịge Iden ahụ mgbe nile, n’enyekwa Adam na Iv ndụmọdụ banyere ọlụ e nyere ha n’aka, ma n’ezikwa ha ihe banyere nnupu-isi nke Ekwensu na ọdịda ya. Ndị mụọ-ozi makwaara ha ọkwa banyere Ekwensu, ma dụọkwa ha ọdụ ka ha ghara ikewapụ onwe ha site n’arụ ibe ya n’ọlụ ha, n’ihi na onye iro a dárá-ada pụrụ izute ha. Ndị mụọ-ozi dụsịrị ha ọdụ ike ka ha soro ntuzi-aka niile nke Chineke nyere ha, n’ihi na ọ bụ naanị n’ime nrube-isi zuru-oke ka ha nwere nchekwa. Na ọbụrụ na ha rubere isi, onye iro a agaraghị enwe ike ọbụla n’arụ ha.NUA 12.1

    Ekwensu malitere ọlụ ya n’aru Iv, ime ka o nupu isi. Ọ bụru ụzọ dahie n’ikpafu site n’ebe dị ya nọ, ọzọ, site n’ikpagharị nsọ gburu-gburu osisi ahụ a machibidoro, ọzọkwa site n’iña ntị n’olu onye ọnwụnwa ahụ, ọbụna imalite inwe obi-abụa n’ihe Chineke kwuworo — N’ụbọchị ahụ nke ị g’eri site na nkpụrụ ahụ ị g’anwụ anwụ. O chere, eleghị-anya nka a pụtaghị n’ezie otu Onye-nwe-anyị kwuru ya. O tinyere aka na nnupu-isi. O wee setipu aka ya, were n’ime nkpụrụ osisi ahụ, ma rie. Ọ bụ ihe dị mma n’ile anya ma dịkwa ụtọ n’ọnụ. O nwewo anya-uku na Chineke napụrụ ha ihe dịrị ha mma. O wee nye dị ya nkpụrụ osisi ahụ, sitekwa n’ụzọ dị otua n’anwa ya. Ọ gwakwara Adam ihe niile bụ nke agwọ ahụ kwuru, ma kọwapụtakwa ihe iju-anya n’ihi ike nke okwu ya.NUA 12.2

    A hụrụ m nwụte nke biakwasịrị n’iru Adam. O wee nọọ n’ụjọ na oke mgbagwoju-anya. Ọ dịkwa ka ndọndọ n’agabiga n’ime uche ya. O metụrụ ya n’uche n’ezie na nka bụ onye iro ahụ nke á maara ọkwa maka ya, ma lee nwụnye ya aghaghị inwụ. A ghaghị ikewa ha. Ihụnanya o nwere n’ebe Iv nọ sịrị ike. Ma sitekwa n’ịda mba nke obi, na o kpebiri isoro ya kere oke ọnọdụ ahụhụ. O wee nara mkpụrụ osisi ahụ, ma rie ya ngwa-ngwa. Mgbe ahụ Ekwensu ñurịrị ọñụ nmeri. O nupuwo isi n’eluigwe, ma nweekwa ndị kwenyere ya hụkwa ya n’anya, ma sorokwa ya na nnupu-isi ya. Ọ dara, ma meekwa ka ndị ọzọ sorokọọ ya daa. Ma ugbua ọ nwawọkwa nwanyị ahụ ka ọ ghara ịtụkwasi Chineke obi, itinye anya n’ime amamihe Ya, na ichọ ịbanye omimi nke atụmatụ Ya zuru oke. Ekwensu maara na nwanyị a agaghị ada naanị ya. Adam, site n’ihụnanya o nwere na Iv, nupụrụ isi n’iwu nke Chineke wee sorọkwa ya daa.NUA 13.1

    Ozi banyere ọdịda madụ gbasara n’eluigwe. Ụda ụbọ-akwara niile kwụsịrị. Ndị mụọ-ozi kpupukwara okpu-eze ha niile site n’isi ha n’iri-uju. Eluigwe niile nọ n’aghara. E nwere nzukọ ikpebi ihe a g’eme madụ abụa ndịa dàrà iwu. Ndị mụọ-ozi tụrụ egwu na ndịa g’esitpụkwa aka ha, ma rie mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ, wee bụrụ ndị nmehie n’adịghị anwụ-anwụ. Kama Chineke sịrị na Ya g’achụpụ ndị nmebi-iwu ahụ site n’ogịge ahụ. A kpọpụtara ndị mụọ-ozi n’otu mgbe ahụ ichegịde ọnụ-ụzọ osisi nke ndụ ahụ. Ọ bụwori atụmatụ Ekwensu haziri nke ọma na Adam na Iv g’enupụrụ Chineke isi, natakwa mgbarụ-iru Ya, ma bụrụ kwa ndị e dubara ikere oke site n’osisi nke ndụ ahụ, ka ha wee dị ndụ ebighị-ebi n’ime nmehie na nnupu-isi, n’ụzọ dị otua nmehie a bụrụ ihe n’adịgịde-adigịde. Ma e zigara ndị mụọ-ozi dị nsọ ichụpụ ha pụa n’ogịge ahụ, ọbụna mgbe a kpọpụtakwara ụsụụ ndị mụọ-ozi ọzọ ichegịde ụzọ gara n’osisi nke ndụ ahụ. Onye ọbụla n’ime ndị mụọ-ozi ndịa dị ike yikwara dịka ndị ji ihe n’aka nri ha, nke yiri mma agha n’egbuke-egbuke.NUA 14.1

    Mgbe ahụ Ekwensu meriri. Ndị ọzọ ka o mere ka ha taa ahụhụ site n’ọdịda ya. Ya ka a chụpụworo site n’eluigwe, ha ka a chụpụkwara site n’ogịge paradais. NUA 14.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents