Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 17—Oke Ndapụ Ahụ Site N’okwukwe

    E wee buru m gaa n’iru rue oge mgbe ndị na ekpere arusi kpagburu ndị nke Kraist, ma gbue kwa ha. Ọbara sọrọ dịka iyi miri. Ndị a maara áhà ha, ndị nwere nmụta, na madụ ọbụla ọzọ, ka e gburu n’enweghị obi-ebere. Ezi-nụlọ ndị bara ọgaranya ka e mekwara ka ha daa ogbenye n’ihi na ha a rapụghị okpukperechi ha. N’agbanyeghị nkpagbu na nhuju-anya niile ndị nke Kraist ndịa nagịdere, ha e wedaghị ogo nke okwukwe ha. Ha debere okpukperechi ha ọcha. A hụrụ m na Ekwensu ñụrịrị ọñụ n’elu nhụju-anya niile nke ụmụ Chineke. Ma Chineke legịdere ma kwenyekwa n’ọnwụ nke ụmụ ya ndị kwesịrị ntụkwasi obi, ma ndị nke Kraist biri ndu n’oge ahụ dị oke egwu ka Ọ hụkwara n’anya nke ukuu; n’ihi na ha nọrọ na njikere ịta ahụhụ n’ihi Ya. Nhụju-anya ọbụla nke ha nagịdere mụbakwara ụgwọ-ọlụ ha n’eluigwe. Kama ọ bụ ezie na Ekwensu ñụrịrị ọñụ n’ihi na ndị nsọ tara ahụhụ, ma o jughị ya afọ. Ọ chọrọ itụrụ uche na anụ-arụ ụka. Nhụju-anya niile ndị nke Krasit ndịa nagịdere duuru ha biarue nso onyewe-anyị, ma durukwa ha ihụrịta onwe ha n’anya, ma kpatakwara ha ịtụ ụjo imehie ya. Ekwensu nwere nmasị iduru ha imehie Chineke; ka ha wee tufue ike ha, ndịdi ha na nguzosike ha. Ọ bụ ezie na e gburu nnukuru nnu madụ, kama ndị ọzọ na etolitekwa iwere ọnọdụ ha. Ekwensu hụrụ na ọ n’etufu ndị nke ya, n’ihi na ọ bụ ezie na ha tara ahụhụ nke nkpagbu na ọnwụ, kama ha bụ ndị e chekwara n’ime Jisọs Kraist, ibụ ndị nke àlà-eze ya, na ọtụrụ ụkpụrụ ya niile ịlụ ọgụ nke oma megide ọchịchị nke Chineke, ma kwatuekwa nzukọ ya. O duru ndị ahụ n’ekpere arụsị ịnakwere ụfọdụ n’ime okwukwe nke ndị nke Kraist. Ha kọọrọ ikwenye n’ọnwụ nke obe na nbilite n’ọnwụ nke Kraist, n’enweghị ngbanwe nke obi, ma nwe nchekube ijikọta onwe ha na ndị n’eso ụzọ Jisọs. O bụ ọghọm dị egwu nye nzukọ! Nka bụ oge ihe ngbu nke akọ-n’uche. Ụfọdụ chere na ọ bụrụ na ha ga- eweda onwe ha ma jikọtakwa onwe ha na ndị ahụ n’ekpere arụsi bụ ndị n’anarawo ụfọdụ okwukwe nke ndị nke Kraist, o g’abụ ụzọ nchegharị ha. Ekwensu n’achọ imerụ ụkpụrụ nke akwụkwọ nsọ. N’ikpeazu a hụrụ m ka e wedara ogo ya, na ndị n’ekweghị-ekwe n’ejikọkwa onwe ha na ndị nke Kraist. Ha a bụrụwori ndị na efe arụsi, ma ọ bụ ezie na ha na-si na ha bụ ndị nke Kraist, ha webatakwara ikpere arụsi ha. Ha gbanwere naanị ihe ndịa ha n’efe ofufe, ịdị n’oyiyi nke ndị nsọ, na ọbụ n’oyiyi nke Kraist, na nke Meri nne Jisọs. Ndị nke Kraist jiri nwayọ jikọta onwe ha na ha, na okpukperechi nke ndị nke Kraist ghọrọ ihe e merụrụ emerụ, ma nzukọ tufukwara ịdị-ọcha ya na ike ya. Ụfọdụ jụrụ ijikọ-aka ha na ha ma chekwata ịdị-ọcha ha, ma feekwa naanị Chineke ofufe. Ha a kpọghịkwa isi-àlà nye oyiyi ihe ọbụla nke dị n’eluigwe n’elu, m’ọbụ nke dị n’ụwà n’okpụrụ ya.NUA 103.2

    Ekwensu ñụrịrị ọñụ n’ihi ọdịda ọtụtụ madụ, ma kpaliekwa nzukọ ahụ daworo ada ka o were aka ike rụgịde ndị niile g’edebe ịdị-ọcha nke okpukperechi ha, ka ha nabata ememe ha nke ife ihe oyiyi m’ọbụ itinye ha n’aka ọnwụ. Ọkụ nke mkpagbu ka a mụnyekwara ọzọ megide ezi nzukọ nke Jisọs Kraist, na e gbukwara nnukuru nnu madụ na e meghị ebere.NUA 105.1

    E gozipụtara ya n’iru m n’ụzọ dị otua: ụsụụ ndị na ekpere arụsi buru ọkọlọtọ jiri-nji nke ihe ndị e sere n’elu ya bụ anyanwụ, ọnwa na kpakpando. Ọgbakọ ahụ dịka ndị n’eyi egwu na ndị n’ewe iwe. Mgbe ahụ e gosikwara m ọgbakọ ọzọ na ebu ọkọlọtọ dị-ọcha nke e dekwasikwara n’elu ya, ịdị-ọcha na ịdị nsọ dịrị Onyenwe-anyị. Iru ha ka a hụkwara nnọgịdesike na nnọyere nke eluigwe. A hụrụ m ndị ahụ n’ekpere arụsi ka ha n’ejeru ha nso, ogbugbu dị ukuu dịkwa. Ndị nke Kraist gbazere n’iru ha, ma otu ọdị igwe ndị nke Kraist ahụ gbakọkwara ọnụ na ejidesikwa ọkọlọtọ ahụ ike. Ka ọtụtụ n’ada, ndị-ọzọ na agbakuru kwa ọkọlọtọ ahụ inọchi ọnọdụ ha.NUA 106.1

    A hụrụ m igwe ndị ahụ n’ekpere arụsi ka ha na akparite ụka n’ime onwe ha. Ha dara n’ime ka ndị nke Kraist rapụ okwukwe ha, ha wee kwekọrịta n’ụkpụrụ ọzọ. A hụrụ m ha ka ha wedatara ọkọlọtọ ha, wee jekuru ndị nke Kraist ahụ nọgịdesịrị ike, ma chọọ ka ha nwe nkwekọrịta. Na nmalite, ọchịchọ ha bụ ihe a jụrụ-aju n’ụzọ ọbụla. Mgbe ahụ m we hụ igwe ndị nke Kraist ahụ ka ha n’enwekwa ntụgharị-uche na nzukọ ha. Ụfọdụ sịrị na ha g’eweda ọkọlọtọ ahụ, nakwerekwa ọchịchọ ndịa ma zọpụta ndu onwe ha, ma n’ikpeazu ha pụrụ inweta ike ibulite ọkọlọtọ ahụ, kama iweda ya mgbe ahụ a hụrụ m ọtụtụ n’ime ndị ọgbakọ nke Kraist ahụ ka ha wedara ọkọlọtọ ahụ, wee kekọtakwa onwe ha na ndị ahụ n’ekpere arụsi; ọbụna mgbe ndị ahụ n’anọgịdesike jidere ọkọlọtọ ahụ, ma bulie ya elu ọzọ. A hụrụ m ndị madụ n’otu n’otu ka ha na arapụ ọgbakọ nke ndị n’ebu ọkọlọtọ ahụ dị-ọcha, wee n’eso ndị ahụ n’ekpere arụsi, n’ejikọtakwa onwe ha n’okpuru ọkọlọtọ ojii ahụ, ikpagbu ndị ahụ n’ejide ọkọlọtọ ọcha ahụ, ma ọtụtụ ka e gebukwara; n’agbanyeghị nka, ọkọlọtọ-ọcha ahụ ka e buliri-elu, ọbụna madụ dị iche-iche ka e wulitekwara elu inọgịde ya gburu-gburu.NUA 106.2

    Ndị Juu ahụ malitere nkpasu iwe nke ndị na ekpere arụsị megide Jisọs, a gbapụghị kwa na nsogbua. N’ime ụlọ ikpe ndị Juu ọnụma juru obi tiri mkpu, mgbe Pailet tụrụ nchichi ima Jisọs ikpe-ọnwụ. Ka ọbara ya dị n’isi anyị na n’isi ụmụ anyị. Agbụrụ ndị Juu hụrụ nmezu nke ajụọ ọbụbụ ọnụ a nke ha kpatara n’isi onwe ha. Ndị n’ekpere arụsị na ndị ọzọ a kpọrọ ndị nke Kraist yikọrọ bụru ndị iro ha. Ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị nke Kraist, sitere na ọnụ-oku nke obi ha n’ihi obe nke Kraist, n’ihi na ndị Juu kpọgịdere Jisọs n’obe chere na mgbe ha na enye ha oke ntaram’ahụhụ ka o g’abụ na ha n’eme ihe n’atọ Chineke ụtọ; ya mere ọtụtụ ndị Juu n’ekweghị-ekwe ka e gburu, e wee na-chụgharịkwa ndị ọzọ site n’otu ebe rue n’ebe ọzọ, ma n’atakwa ha ahụhụ n’ụzọ niile dị iche-iche.NUA 107.1

    Ọbara nke Kraist, na nke ndị n’eso ụzọ ya, ndị ha gburu egbu, nọkwa n’isi ha, nke e letakwara ha site n’ikpe dị oke egwu. Ọbụbụ-ọnụ nke Chineke sọkwara ha, wee bụrụ ihe e ji eme okwu na ihe ikwa-emo nye ndị n’ekpere arụsi ma nyekwa ndị nke Kraist. Ha bụrụ ndị a jụrụ aju, ndị e wedara n’àlà na ndị a kpọrọ asị, dịka a ga asi na ọbụbụ-ọnụ nke Ken dakwasịrị ha. Ma otu ọdị a hụrụ m na Chineke kpuchitere ndịa n’ụzọ dị ebube, na o mere ka ha gbasaa n’akụkụ nile nke ụwà, ka e wee hụ ha dịka ndị e letara n’ụzọ pụrụ iche site na ọbụbụ-ọnụ nke Chineke. A hụrụ m na Chineke a jụworị ndị Juu dịka obodo; kama otu akụkụ n’ime ha dịkwa ndị a g’eme ka ha dọkaa ihe mgbochi ahụ dị n’obi ha. Ụfọdụ g’ahụkwa na ihe e buru n’amụma e mezuwo banyere ha, na ha g’anarakwa Jisọs dịka onye-nzọpụta nke ụwà, ma hụkwa nmehie ukuu nke obodo ha n’ijụ Jisọs, na ikpọgịde ya n’obe. Madụ dị-iche-iche n’etiti ndị Juu g’echgharịkwa; kama dịka obodo, Chineke ajụwo ha ebighị-ebi.NUA 108.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents