Isi Nke 37—Nnapụta Nke Ndị Nsọ
- Okwu Nmalite
- Isi Nke 1—Ọdịda Nke Ekwensu
- Isi Nke 2—Ọdịda Nke Madụ
- Isi Nke 3—Atụmatụ Nke Nzọpụta
- Isi Nke 4—Ọbibia Mbụ Nke Kraist
- Isi Nke 5—Ije-Ozi Nke Kraist
- Isi Nke 6—Nnwogha Ahụ
- Isi Nke 7—Nrafu A rafuru Kraist
- Isi Nke 8—Ikpé Nke Ekpèrè Jisọs
- Isi Nkie 9—Nkpọgịde N’obe Nke Kraist
- Isi Nke 10—Nbilite N’ọnwụ Nke Kraist
- Isi Nke 11—Ila N’eluigwe Nke Kraist
- Isi Nke 12—Ndị N’eso Ụzọ Kraist
- Isi Nke 13—Ọnwụ Nke Stiven
- Isi Nke 14—Mgbanwe Nke Sọl
- Isi Nke 15—Ndị Juu Kpebiri Igbu Pọl
- Isi Nke 16—Pọl Jere Leta Jerusalem
- Isi Nke 17—Oke Ndapụ Ahụ Site N’okwukwe
- Isi Nke 18—Ihe-Omimi Nke Nmebi-Iwu
- Isi Nke 19—Ọnwụ, Ọ bụghị Ndu Ebighị-ebi N’ime Ahụhụ
- Isi Nke 20—Nmegharị Ihe Ahụ
- Isi Nke 21—Nzukọ Na Ụwà Dịkọrọ N’otu
- Isi Nke 22—William Miller
- Isi Nke 23—Ozi Mụọ-ozi Nke Mbụ Ahụ
- Isi Nke 24—Ozi Mụọ-ozi Nke Abụa Ahụ
- Isi Nke 25—Ngosipụta Ndị N’ele-Anya Ọbịbịa-Abụa Ahụ
- Isi Nke 26—Ihe Ngosi ọzọ
- Isi Nke 27—Ebe-Nsọ Ahụ
- Isi Nke 28—Ozi Mụọ-ozi Nke Atọ Ahụ
- Isi Nke 29—Ihe Nnọkwasị Siri-Ike
- Isi Nke 30—OFufe Mụọ-ỌJọọ
- Isi Nke 31—Anya Uku
- Isi Nke 32—Nkwagharị Ahụ
- Isi Nke 33—Ajụọ-Omume Di Iche-iche Nke Babịlon
- Isi Nke 34—Oke Iti-Mkpu Ahụ
- Isi Nke 35—Ozi Nke Ato Ahụ Mechiri
- Isi Nke 36—Oge Nke Nsogbu Jekob
- Isi Nke 37—Nnapụta Nke Ndị Nsọ
- Isi Nke 38—Ụgwọ-Ọlụ Nke Ndị Nsọ
- Isi Nke 39—Ụwà Tọgbọrọ N’efu
- Isi Nke 40—Nbilite N’ọnwụ Nke Abụa Ahụ
- Isi Nke 41—Ọnwụ Nke Abụa Ahụ
Search Results
- Results
- Related
- Featured
- Weighted Relevancy
- Content Sequence
- Relevancy
- Earliest First
- Latest First
- Exact Match First, Root Words Second
- Exact word match
- Root word match
- EGW Collections
- All collections
- Lifetime Works (1845-1917)
- Compilations (1918-present)
- Adventist Pioneer Library
- My Bible
- Dictionary
- Reference
- Short
- Long
- Paragraph
No results.
EGW Extras
Directory
Isi Nke 37—Nnapụta Nke Ndị Nsọ
Obụ n’etiti abali ka Chineke họọrọ ịnapụta ndị nke ya. Ka ndị ajụọ-omume n’akwa emo gburu-gburu ha, anwụ pụtara n’otu ntabi-anya, na acha n’ike ya niile, ma ọnwa guzoro out-ebe. Ndị ajụọ- omume hụrụ ọnọdụa n’oke iju-anya. Ọtụtụ ihe iribama na ọlụ-ebube dị iche-iche mere otu soro ibe ya. Ihe niile dịka ha tụgharịrị site n’ọnọdụ e jiri mara ha. Ndị-nsọ ji obi añụrị legịde ihe ndịa mekụtara nzọpụta ha.NUA 217.2
Isi-iyi dị iche-iche kwụsịrị isọgharị. Ọkpụrụkpụ igwe-ojii dị iche-iche pụtasịrị, ma sọkọta onwe ha isi. Ma ọdị otu ebe nke were anya na ebube ya nọkọtara, bụkwa ebe olu nke Chineke sitere wee bia, dịka ọtụtụ miri, nke kwagharịrị eluigwe na elu ụwà. Oke àlà ọma jijiji mara. Ili niile ka a kwahere, ma ndị niile nwụrụ n’okwukwe n’okpụrụ ozi mụọ-ozi nke atọ, n’edebe ụbọchị izu ike, pụtara site n’ebe ndịna ha bụ aja, n’ebube, inụrụ ọgbụgba-ndụ nke udo ahụ Chineke g’eme ya na ndị niile debere iwu ya.NUA 218.1
Mbara eluigwe meghere ma mechikwa, ma nọrọkwa n’ime ọgbaghara. Ugwu niile kwagharịrị dịka eriri nọ n’ikuku, ma kwapụkwa ọtụtụ nkume akụkụ niile gburu-gburu. Osimiri sụgharịrị dịka n’ite ọkụ, ma gbọpụtakwa ọtụtụ nkume n’elu-àlà. Ma dịka Chineke kwupụtara ụbọchị na oge-awa nke ọbịbịa Jisọs, ma nyekwa ogbụgba-ndụ ebighị-ebi ahụ n’aka ndị nke ya, o kwuru otu ahịrị okwu, ma derekwa duu, mgbe mkpụrụ okwu ndị ahụ n’agami n’ime ụwà. Ndị Izrel nke Chineke guzoro were kwa anya ha tụkwasị n’elu, n’ege ntị okwu ndịa ka ha si n’ọnụ Jehova pụta, n’emikpu n’ime ụwà dịka ọtụtụ mkpọtụ nke egbe- eluigwe dakarịrị ụda. Ọ bụ ihe nro dị oke egwu. N’ọgwụgwụ nke ahịrị okwu ọbụla ndị-nsọ tikwara mkpu, Otuto! Haliluya! Iru ha chapụkwara site n’ebube nke Chineke; ma ha nwupụrụ n’ime ụdị ebube ahụ nke nwuru n’iru Mosis mgbe ọ rịdatara site n’ugwu Sainai. Ndị ajụọ-omume apụghịkwa ilegịde ha anya n’ihi ebube dị otua. Ma mgbe e kwupụtara ngọzi ahụ n’adịghị agwụ-agwụ n’isi ndị niile nyere Chineke nsọpụrụ, n’idebe ụbọchị izuike ya nsọ, oke iti-mkpu nke nmeri dara megide nw’anụ-ọhia ahụ, na ihe-oyiyi ya.NUA 218.2
Mgbe ahụ ka ememe nke iri afọ ise malitere, mgbe àlà g’ezu ike. A hụrụ m oru ahụ nke n’efe Chineke ka o biliri na ọñụ nke nmeri, ma hụchapụkwa nkpọrọ-igwe niile kegidere ya, mgbe ajụọ onye nwe ya nọ na mgbọgwoju-anya, na amaghịkwa ihe ọ g’eme; n’ihi na onye ajụọ-omume apụghị ighọta nkpụrụ okwu nke olu Chineke. Na nso nso, oke mbara-igwe ọcha pụtara. N’elu ya ka Nwa nke madụ nọkwasịrị.NUA 219.1
Mbara-igwe nka mgbe ọ pụtara na nmalite n’ebe dị anya, dịịrị ntakịrị. Mụọ-ozi ahụ sịrị na ọ bụ ihe ngosi nke Nwa nke madụ. Ma dịka igwe-ọcha ahụ n’abia nso elu-ụwà, anyị letara oke ịma-mma nke ebube na ịdị ukuu nke Jisọs ka ọ n’agbaru nmeri. Ahịrị igwe ndị mụọ-ozi, ndị okpu-eze ha n’enwụ enwụ n’isi ha, n’edukwa ya n’ụzọ ya. Ọ dịghị asụsụ pụrụ ikọwa ụdị ebube nke ọnọdụ ahụ. Igwe ndị dị ndụ n’ime ịdị-ukuu, na ebube nke n’enweghị atụ, nọgịdere n’abiaru nso, mgbe ahụ ka anyị pụrụ ihụzu ya anya bụ ezi Jisọs ahụ n’onwe ya. O kpughịkwa okpu-eze nke ogwu; kama okpu-eze nke ebube kpudoro egedege-iru Ya dị nsọ. N’elu ihe oyiyi ya n’apàtà ụkwụ ya ka e dere áhà sị, EZE NKE NDỊ-EZE NA ONYE-NWE NKE NDỊ-NWE NIILE. Anya ya abụa dịka ire-ọkụ, ụkwụ ya nwere ụdị nke ezi ọla-nchara, ma olu okwu ya dakwara dịka nke ọtụtụ ngwa ihe eji akpọ-ụbọ. Egedege-iru ya chapụrụ-achapụ dịka nke anyanwụ etiti-ụbọchị. Ụwà niile mara jijiji n’iru Ya, ma mbara eluigwe zopụrụ dịka ibe-akwụkwọ mgbe a piachikọtara ya, ma ugwu niile na agwa-etiti niile chipụrụ n’ọnọdụ ha. Ma ndị-eze niile nke ụwà, na ndị á màrà áhà ha, na ndị ọgaranya, na ndị-isi niile, na ndị ukwu, na onye nọ n’agbụ, ma onye nwere onwe ya, zochara onwe ha n’ime olulu dị iche-iche na n’ime nkume nke ugwu dị iche-iche. Ma n’asị ugwu ndịa na oke nkume ndịa, dakwasi anyị, ma zopụ anyị site n’iru Onye ahụ nke n’anọkwasị n’oche-eze ahụ, na sitekwa n’iwe nke nw’atụrụ ahụ; n’ihi na oke ụbọchị nke iwe ya abiawo; ma onye pụrụ iguzo?NUA 219.2
Ndị ahụ na nwa-oge gara aga chọrọ ịla ụmụ Chineke kwesịrị ntụkwasi-obi n’iyi n’ụwà, na ele ebube nke Chineke ka ọ n’adịyere ha. Ha a hụwori ha n’ebube. Ma n’ime ọnọdụ nkpagbu niile ha anụwokwarị olu nke ndị-nsọ ahụ na nkpu-ọñụ, na asi, Lee, nka ka Chineke anyị bụ, anyị elewo anya ya, o ga zọpụtakwa anyị. Elu-ụwà kwara eneke nke ukuu mgbe olu nke nwa Chinek kpotere ndị nsọ dara n’ụra ọnwụ. Ha zara oku ahụ, ma pụtakwa na- eyikwasị ebube nke a nwụghị-anwụ, n’etikwa nkpu, Nmeri! Nmeri! Megịde ọnwụ na ili. Ọnwụ, olee ebe ihe ọgbụgba gị dị? Ili olee ebe nmeri gị dị? Mgbe ahụ ndị-nsọ dị ndu, na ndị nsọ bilitere n’ọnwụ, weliri olu ha elu n’ogologo iti-nkpu nke nmeri. Ndị-ọria niile ahụ laworo n’ime-àlà ili bilikwara n’ime a nwụghị-anwụ ahụ-ike na ume ndụ. Ndị-nsọ dị ndụ ka e nwoghara n’otu oge, n’otu ntabi anya, ka e welikọkwara ha na ndị ahụ biliri n’ọnwụ, n’otu ha wee zute onye nwe ha n’elu. Lee nụ ka o si bụrụ nzukọ dị ebube. Ndị enyi niile ọnwụ kegaworo, ka e jikọkwara ọzọ, nmadịghị mgbe ha g’ekewakwa ọzọ.NUA 220.1
N’akụkụ abụa nke ụgbọ-àlà ọkụ ahụ bụ ọtụtụ nku, na okpuru ya bụkwa ụkwụ-igwe ndị dị ndụ, ma dịka ụgbọ-àlà ọkụ ahụ n’arigo n’elu, ụkwụ igwe ndị ahụ tiri-mkpu, Nsọ, ma nku ndị ahụ, ka ha n’aga, tikwara nkpu, Nsọ, ma ahịrị igwe ndị mụọ-ozi gbara igwe ojii ahụ gburu-gburu, tiri nkpu, Nsọ, Nsọ, Nsọ, Onyenwe-anyị Chineke nke pụrụ ime ihe niile. Ma ndị-nsọ n’ime igwe ojii ahụ tiri mkpu, otụtọ, Aliluya. Ma ụgbọ-àlà ahụ rịgoro elu rue obodo nsọ ahụ. Tutu ha abanye obodo nsọ ahụ, e doziri ndị nsọ ahụ n’ọgbakọ ncherịta iru anọ zuru oke, nke Jisọs n’anọdụ n’etiti. Ogo ya karịrị ndị nsọ niile, karịkwa ndị mụọ-ozi niile. Ịdị ukuu ya na iru marà-màrà ya, ka ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ na ahụzu anya.NUA 221.1